IGBO CATHOLIC COMMUNITY (ICC) OF NEW YORK, AT ANGELA MERICI PARISH, BRONX, NEW YORK. SUNDAY BULLETIN: 7TH SUNDAY OF EASTER (YEAR C) SUNDAY, MAY 12, 2013 HYMNS: ENTRANCE: OFFERTORY: K’ANYI JEE N’ULO CHUKWU. IN THANKSGIVING►ONYINYE OMA► CHINEKE ONYEOMA CONSECRATION: ANYI N’ARIO GI CHINEKE NNA COMMUNION: ANYI N’EKELE GI, NNE OMA POST COMMUNION: UWA NILE GORIBE DISMISSAL: MARY NNE OMA EKPERE MMEGHEE Onyenweanyi, Nna di obi oma, biko were ebere nara ekpere anyi. Ebe anyi kwere na Onye Nzoputa nke uwa binyere Gi b’ebube eze Gi; biko meekwa ka anyi ghota na O nonyere anyi mgbe nile ruo na ngwucha nke uwa, dika O siri kwe anyi na nkwa. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi. IHE OGUGU NKE MBU ewetara n’Oru ndi Ozi 7:55-60 Isi Okwu: A na m ahu Nwa nke Mmadu ka Oguzo n’aka nri nke Chineke Ma ebe Stiven juputara n’ike Mmuo Nso, o wee legide anya n’eluigwe, hu ebube Chineke, hukwa Jesu ka O guzoro n’aka nri nke ike Chineke. O wee si ha: “Lee! Ana m ahu eluigwe ka e meghere ya, na-ahukwa Nwa nke Mmadu ka O guzo n’aka nri nke ike Chineke!” Ma ha weere oke olu tie mkpu, kwuchie aka n anti, were oso nukwasi ya. Ndi akaebe ugha, ndi gburu Stiven, wee wusa uwe ha n’ukwu otu nwokorobia a naakpo Sol ka o legide ha anya. Ha no na-atu Stiven nkume ka o na-akpoku Onyenweanyi si: “Onyenweanyi, Jesu nara mmuo m nke oma!” O wee gbuo ikpere n’ala, werekwa oke olu tie mkpu si: “Onyenweanyi! A tukwasila mmehie nke a n’isi ha! Mgbe o kwusiri nke a, o wee daa n’ura onwu. Okwu nke Oseburuwa Ekele diri Chukwu. ABUOMA NA AZIZA YA 96:1-2, 6-7, 9 Az. 1.9 Aziza: Onyenweanyi bu Eze kacha eze n’uwa nile. 1. Onyenweanyi bu Eze. Ka uwa nuria onu. Ka ndi nile bi obodo nile osimiri gbara gburugburu nurikwa onu. Ikpe ziri ezi na ezi omume bu ntoala nke oche Eze Ya. Az. 2. Mbara igwe na-ekwuputa ikpe nkwumoto Ya. Mmadu nile na-ahu ebube Ya. Unu ndi mmuo sekpuerenu Ya. Az. 3. Onyenweanyi! I bu Onye kacha elu n’elu uwa nile. O bukwa Gi kachasi chi nile ndi ozo elu. Az. IHE OGUGU NKE ABUO ewetara n’Akwukwo Mkpughe 22:12-14, 16-17, 20 Isi Okwu: Bia, Onyenweanyi Jesu! Mu onwe m bu Jon nuru olu n’agwa m okwu si: “Lee, ana M abia ososo. Ugwo oru M dikwa n’aka M. Aga M eji ya abia, ikwughachi onye o bula dika oru ya siri di. Mu onwe M bu Alfa na Omega, onye mbu na onye ikpeazu, Mmalite na Ogwugwu” Ngozi na-adiri ndi na-asachapu uwa mwuda ha nke oma. N’ihi na Chineke ga-enye ha ike iri mkpuru sitere n’osisi nke ndu ahu. O ga-enyekwa ha ike ibanye n’ime obodo ahu site n’onu uzo ama Ya nile. “Mu onwe M bu Jesu zitere gi mmuo ozi M, ka o kpugheere gi ihe ndi a nile, nke i ga-ezi Nzuko nile. Mu onwe M bu Mgborogwu David, burukwa Nwa si n’agburu David puta. Mu onwe M bukwa Kpakpando Ututu ahu nke na-enwu oke onwunwu.” Mmuo Nso na Nwanyi ahu a na-alu ohuru na-ekwu, si: “Bia” Onye o bula nuru oku a, ya kwukwaa si: “Bia” Onye o bula akpiri naakpo nku, ya bia! Onye o bula o na-agu, ya nara mmiri nke ndu ahu nuo n’akwughi ugwo o bula! Onye Ahu nke na-agba ama banyere ihe ndi a nile na-ekwu, si: “E, ana M abia ososo!” Amen! Bia, Onyenweanyi, Jesu! Okwu nke Oseburuwa Ekele diri Chukwu. ALELUYA! Aleluya, aleluya!! Onyenweanyi kwuru si: “Agaghi M ahapu unu dika nwa enwe nne na nna. Aga M aloghachikwute unu. Mgbe ahu, obi unu ga-anuri onu. Aleluya!!! OZIOMA nke si n’Ozioma di aso Jon dere 17:20-26 Isi Okwu: Ka ha buru otu dika anyi onwe anyi Jesu leliri anya n’eluigwe wee si: “O bughi nani ha ka M na-ekpere ekpere. Kama ana M ekpekwa ekpere maka ndi sitere n’okwu ha wee kwere na M. Ana M ekpekwa ekpere ka ha nile wee buru otu. Nna! Mee ka ha diri n’ime Anyi, dika Gi onwe Gi si di n’ime M, Mu onwe M adikwa n’ime Gi. Mee ka ha buru otu, ka uwa dum wee kwere na O bu Gi zitere M. Otito nke I nyere M ka M nyere ha, ka ha wee buru otu dika Anyi onwe Anyi si buru otu: Mu onwe M n’ime ha; Gi kwa n’ime M, ka ha wee buru otu n’uzo zuru oke, ka uwa wee kwerekwa na Gi zitere M; na gi hukwara ha n’anya dika I siri hu M n’anya. “Nna! Achoro M ka ndi nile I nyere M soro M noro n’ebe M no, ka ha wee hu otito nke I nyere M, n’ihi na I huru M n’anya tupu a too nto ala uwa. Nna, Onye ezi omume! Uwa amaghi Gi, ma ama M Gi; ndi a makwa na gi zitere M. Emere M ka ha mara Gi. Aga M emekwa ka ha mata Gi karia, ka ihunanya nke I nwere n’ebe M no wee di n’ime ha, Mu onwe M kwa n’ime ha.” Okwu nke Oseburuwa Otito diri Gi, Kristi. EKPERE NHUNYE Onyenweanyi, biko, nara onyinye na aririo nke anyi bu ndi kwerenu. Site n’aja nke a di aso na ofufe nso anyi na-efe Gi, mee ka anyi bata n’otito nke eluigwe. Site na Kristi Dinwenu anyi. EKPERE A NATACHAA ORIRI NSO Chineke onye nzoputa anyi, chee nti nuru aririo anyi. Biko, were ihe omimi nke a kacha nso mee ka Nzuko Gi gazuru uwa nile, nke bu ahu Kristi, nwee ntukwasi obi inweta otu ebube ahu, e tubere Kristi, onye bu isi anyi. Site na Kristi Onyenweanyi. [7th SUNDAY of Easter REFLECTION] Stephen fell on his knees and cried out in a loud voice, 'Lord, do not hold this sign against them' Act7:60 This guy Stephen was a son of a Jewish woman. The visionary in the book of Revelation heard this prayer: 'Let the one who thirsts come forward, and the one who wants it receive the gift of life-giving water' Rev22;17. The Lord prays: ' I will not leave your orphans..'Jn14;18. Significantly, today the Lord prays for the children given to Him by His father that they remain united and be one and especially that they love one another. The Church is our Mystical Mother that embodies everything that concerns our welfare and channels of graces. Every Mother like the hen gathers her chicken around her and would want them be united in one bond of love. We pray for Mothers who have experienced pains and sorrows due to the prodigality of their children, for those who lost their children to accidental and natural deaths, those whose children never come to visit them or talk to them and also those whose children are in bondage of physical and spiritual prisons. We give thanks to God for Mothers who have continued to stand by their children at all times especially during hard times and sickness. For those whose children give reason to be happy, we thank God. For the Mothers who have gone to be with the Lord, we praise God. Our Mothers are the Best and we appreciate all their love and sacrifices. We Love You Mothers. M= for the Moments together, O= your Optimism, T= for your Tenderness, H= Happiness you bring, E= for your Everlasting love, R= for the Respect we have for you. HAPPY MOTHERS DAY SUPER MOTHERS [Motherhood includes every woman, both potential and actual, physical and spiritual ones] Every Mother should cultivate the habit of prayers in her household and pray for the love and unity of the family. Produced by ICC Choir
© Copyright 2026 Paperzz